Isaiah 47

Ọdịda Babilọn

1“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu,
gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn,
nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze,
gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn.
Agaghị akpọkwa gị
onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.
2Were nkume igwe nri gwee ọka,
wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị.
Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị,
mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.
3A ga-ekpughe ọtọ gị,
tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere.
Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ,
agaghị m elekwa anya nʼazụ.”

4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye nsọ Izrel.

5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,
gị eze obodo nke ndị Kaldịa;
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị
nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
6Ewesoro m ndị m iwe,
mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ.
Eweere m ha tinye gị nʼaka,
ma i gosighị ha obi ebere.
Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha
ka ị bokwasịrị ibu arọ.
7I kwuru sị,
‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’
Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a,
ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.

8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.
Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,
na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.
O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,
maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
9Ma lee anya!
Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị
na mberede.
Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.
Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,
agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.
10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị
ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’
Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,
mgbe ị na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’
11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,
ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.
Oke mbibi ga-adakwasị gị
nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;
Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya
ga-abịakwasị gị na mberede.

12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,
na ihe mgbaasị gị niile.
Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.
Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.
13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.
Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.
Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.
Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
14Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ọkụ ga-erechapụkwa ha.
Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha
site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike.
Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye,
nke a na-anya nʼoge oyi.
15Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị,
bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha
site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha;
ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.
Copyright information for IboBIU